2rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.
3Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.
4Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”
5Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.
6Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”