Ọrụ Ndị Ozi 9

Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.

Acts 9:5 (UKJV) And he said, Who are you, Lord? And the Lord said, I am Jesus whom you persecute: it is hard for you to kick against the pricks.

3Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.

4Ọ dara nʼala, nụ olu na-akpọ ya oku, “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”

5Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.

6Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”

7Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.