Ọrụ Ndị Ozi 9

Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.

Acts 9:7 (UKJV) And the men which journeyed with him stood speechless, hearing a voice, but seeing no man.

5Ọ sịrị, “Ị bụ onye, Onyenwe anyị?” Olu ahụ zaghachiri, “Abụ m Jisọs onye ị na-akpagbu.

6Ugbu a, bilie, baa nʼime obodo, a ga-agwa gị ihe ị na-aghaghị imezu.”

7Ndị ikom ha na ya so aga guzoro nʼebe ahụ, ma ha enweghị ike ikwu okwu. Ha nụrụ olu ahụ, ma ha ahụghị onye ọbụla.

8Sọl si nʼala bilie, ma nʼagbanyeghị nʼanya ya meghere emeghe, ọ dịghị ihe o nwere ike ịhụ. Nke a mere na ha sekpụrụ ya nʼaka dubata ya na Damaskọs.

9Ọ hụghị ụzọ ụbọchị atọ, o nweghị ike iri nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.