38Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.”
39Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
40Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.
41O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ.
42A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.