40Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.
41O nyeere ya aka ka ọ kwụrụ ọtọ. Ọ kpọrọ ndị nsọ niile nọ nʼebe ahụ, ha na ụmụ nwanyị ahụ di ha nwụrụ gosi ha na ọ dị ndụ.
42A nụrụ akụkọ ihe a mere nʼebe niile na Jopa, nke mere ka ọtụtụ kwere nʼOnyenwe anyị.
43Ọ nọgidere na Jopa ọtụtụ ụbọchị. Ọ nọdụrụ nʼụlọ Saimọn, onye ọrụ ya bụ idozi akpụkpọ anụ.