8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla, nʼelu uwe ndị anatara na mbe. Nʼime ụlọnsọ chi ha, ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha, ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida, ndị sikwara ike dịka osisi ook. Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu, na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu, duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ, ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
12“Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.