13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
16Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu, ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.