11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma, họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait. Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
12“Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya. Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu, dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ, ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume, ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla, ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ. Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.