10“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
11“Akwaturu m ụfọdụ nʼime unu dịka mgbe Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra. Unu dịka ọlọkọ nkụ ọkụ alọpụtara site nʼọkụ, ma unu alọghachikwuteghị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
12“Nʼihi ya, ihe ndị a ka m na-aga ime gị, gị bụ Izrel. Ebe ọ bụkwa na ejikerela m ime gị ihe ndị a, jikere, O Izrel, izute Chineke gị.”
13Ma lee, onye na-akpụ ugwu niile, onye na-ekekwa ifufe, nke na-ekpughekwa echiche uche ya nye mmadụ, onye na-emekwa ka chi ọbụbọ ghọọ ọchịchịrị, na-azọchakwa ugwu niile nʼọbụụkwụ ya, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.