Emọs 4

Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Amos 4:8 (UKJV) So two or three cities wandered unto one city, to drink water; but they were not satisfied: yet have all of you not returned unto me, says the LORD.

6“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

7“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.

8Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

9“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.