Emọs 4

“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.

Amos 4:7 (UKJV) And also I have withheld the rain from you, when there were yet three months to the harvest: and I caused it to rain upon one city, and caused it not to rain upon another city: one piece was rained upon, and the piece whereupon it rained not withered.

5Chụọnụ aja nsure ọkụ dịka aja ekele, site nʼachịcha koro eko; kpọsaakwanụ banyere onyinye afọ ofufu niile unu na-enye, nyaanụ isi banyere ha, unu bụ ndị Izrel, nʼihi na nke a bụ ihe unu hụrụ nʼanya ime.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

6“E mere m ka unu nwee eze dị ọcha nʼobodo unu niile, mekwa ka ụkọ nri dị nʼọnụmara unu niile ma unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

7“Ọzọkwa, Mụ onwe m gbochikwara mmiri izoro unu, mgbe ọ fọdụrụ ọnwa atọ tupu owuwe ihe ubi ebido. Enyere m otu obodo mmiri ozuzo, ma gbochie ya izoro obodo nke ọzọ. Mmiri zoro nʼotu ubi, ma nke mmiri ezoghị na ya kpọnwụrụ.

8Ndị si obodo abụọ maọbụ atọ chọrọ mmiri ọṅụṅụ jee nʼobodo ọzọ, ma ha enwetaghị nke ha ji aṅụju afọ, ma nʼime ihe ndị a niile unu alọghachikwuteghị m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

9“Ezitere m ọrịa nchakpọ nʼubi unu niile a gbara ogige, ya na ubi vaịnị unu niile, ọtụtụ oge, werekwa ọrịa na-eripịa ihe ubi na ọmụma ebu bibie ha, zitekwa igurube nke richapụrụ osisi fiig na osisi oliv unu niile, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.