Emọs 5

Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, nke unu kpụrụ nye onwe unu.

Amos 5:26 (UKJV) But all of you have borne the tabernacle of your Moloch and Chiun your images, the star of your god, which all of you made to yourselves.

24Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

25“Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara, unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?

26Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, nke unu kpụrụ nye onwe unu.

27Ya mere, aghaghị m ime ka e buru unu gaa nʼala ndị ọzọ, nʼofe Damaskọs,” ka Onyenwe anyị, Onye ahụ aha ya bụ Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.