Emọs 5

Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

Amos 5:24 (UKJV) But let judgment run down as waters, and righteousness as a mighty stream.

22A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.

23Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu.

24Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

25“Iri afọ anọ ndị ahụ unu nọ nʼọzara, unu chụụrụ m aja, unu o wetara m onyinye, unu ụlọ Izrel?

26Unu ga-ebuli eze unu Sakut elu, na arụsị Kayiwan, chi kpakpando unu, bụ onyinyo unu, na chi niile a kpụrụ akpụ, nke unu kpụrụ nye onwe unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.