Emọs 5

Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel, “Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike, ka naanị narị ga-afọdụ, obodo unu na-ezipụ narị ndị ike ka naanị iri ga-afọdụrụ.”

Amos 5:3 (UKJV) For thus says the Lord GOD; The city that went out by a thousand shall leave an hundred, and that which went forth by an hundred shall leave ten, to the house of Israel.

1Nụrụnụ okwu ndị a, nke a ka m na-ekwu megide unu, ọ bụ mkpu akwa maka gị ezinaụlọ nke Izrel:

2“Izrel, nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, a daala, ọ gaghị ebilite ọzọ, onye a gbahapụrụ nʼala nke aka ya, ọ dịkwaghị onye ga-ekulite ya.”

3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-asị Izrel, “Obodo unu nke na-ezipụ puku ndị ike, ka naanị narị ga-afọdụ, obodo unu na-ezipụ narị ndị ike ka naanị iri ga-afọdụrụ.”

4Ihe ndị a bụ okwu Onyenwe anyị na-agwa ụlọ Izrel, “Chọọnụ m, ka unu dịrị ndụ.

5Unu achọla Betel, unu abanyekwala na Gilgal, maọbụ ga ije ruo Bịasheba. Nʼihi na Gilgal aghaghị ije biri nʼala ọzọ, ebe Betel ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.