Emọs 8

Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.

Amos 8:12 (UKJV) And they shall wander from sea to sea, and from the north even to the east, they shall run back and forth to seek the word of the LORD, and shall not find it.

10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, meekwa ka unu kpụchaa isi unu. Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.

11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.

12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.

13“Nʼụbọchị ahụ, “ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.

14Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi, ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’ nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.