11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, “mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.
12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, ma ha agaghị achọta ya.
13“Nʼụbọchị ahụ, “ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
14Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi, ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’ nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”