Emọs 9

“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.

Amos 9:13 (UKJV) Behold, the days come, says the LORD, that the plowman shall overtake the reaper, and the treader of grapes him that sows seed; and the mountains shall drop sweet wine, and all the hills shall melt.

11“Nʼụbọchị ahụ, “aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.

12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.

13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.

14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta. “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.

15Aga m akụ Izrel nʼala ha. A gaghị ehopukwa ha ọzọ site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.