12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.
13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.
14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta. “Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.
15Aga m akụ Izrel nʼala ha. A gaghị ehopukwa ha ọzọ site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.