Emọs 9

Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.

Amos 9:2 (UKJV) Though they dig into hell, thence shall mine hand take them; though they climb up to heaven, thence will I bring them down:

1Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị, “Tie ọnụ ogidi ndị a ihe, ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji. Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile; aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ. Ọ dịghị onye ga-agbapụ, ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.

2Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.

3Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.

4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.