Emọs 9

Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

Amos 9:4 (UKJV) And though they go into captivity before their enemies, thence will I command the sword, and it shall slay them: and I will set mine eyes upon them for evil, and not for good.

2Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.

3Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.

4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.

6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.