Emọs 9

Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.

Amos 9:6 (UKJV) It is he that builds his stories in the heaven, and has founded his troop in the earth; he that calls for the waters of the sea, and pours them out upon the face of the earth: The LORD is his name.

4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. “Aga m elekwasị ha anya m abụọ nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”

5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.

6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, ma na-awụsa ha nʼala, aha ya bụ Onyenwe anyị.

7“Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?

8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. Aghaghị m ịla ya nʼiyi, kpochapụ ya site nʼelu ụwa, naanị na m agaghị ebibicha ụlọ Jekọb kpamkpam.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.