Ndị Kọlọsị 1

Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu.

Colossians 1:2 (UKJV) To the saints and faithful brethren in Christ which are at Colosse: Grace be unto you, and peace, from God our Father and the Lord Jesus Christ.

1Pọl, onye e mere onyeozi Kraịst Jisọs, site nʼọchịchọ Chineke, ya na nwanna anyị Timoti,

2Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu.

3Mgbe ọbụla anyị na-ekpere unu ekpere anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.

4Nʼihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nʼime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị nsọ niile nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.