Ndị Kọlọsị 2

Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.

Colossians 2:1 (UKJV) For I would that all of you knew what great conflict I have for you, and for them at Laodicea, and for as many as have not seen my face in the flesh;

1Ọ bụ ọchịchọ m ka unu ghọta otu m si na-agbasi mgba ike nke ukwuu nʼihi unu, na nʼihi ndị nọ nʼobodo Laodisia, na ndị niile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.

2Ebumnobi m bụ ka a gbaa ha ume, jikọọkwa ha nʼotu nʼịhụnanya, ka ha nweta ụba niile nke nghọta zuruoke na amamihe nke ihe omimi Chineke ahụ bụ Kraịst nʼonwe ya.

3Ọ bụkwa nʼime ya ka ụlọakụ ihe zoro ezo niile nke amamihe na ihe ọmụma dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.