Ndị Kọlọsị 2

Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri.

Colossians 2:11 (UKJV) In whom also all of you are circumcised with the circumcision made without hands, in putting off the body of the sins of the flesh by the circumcision of Christ:

9Nʼihi na nʼime Kraịst ka izuoke niile nke Chineke bi nʼụdịdị mmadụ.

10Ya mere, unu nwere ihe niile nʼime ya, onye bụ isi ndị niile na-achị achị, onye bụkwa isi nʼebe ike na ịchị isi niile dị.

11Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri.

12Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya.

13Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.