11Nʼime ya, e biri unu ugwu nke ejighị aka bie, site nʼiwepụ ọdịdị anụ ahụ nʼobibi ugwu nke Kraịst biri.
12Mgbe e likọtara unu na ya na baptizim, e sitere nʼọnwụ kpọlite unu na ya site nʼokwukwe ahụ dị nʼike Chineke onye sitere nʼọnwụ kpọlite ya.
13Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile,
14kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.
15Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.