Ndị Kọlọsị 2

Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.

Colossians 2:15 (UKJV) And having spoiled principalities and powers, he made a show of them openly, triumphing over them in it.

13Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile,

14kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.

15Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.

16Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike.

17Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.