Ndị Kọlọsị 2

Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike.

Colossians 2:16 (UKJV) Let no man therefore judge you in food, or in drink, or in respect of an holyday, or of the new moon, or of the sabbath days:

14kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.

15Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.

16Nʼihi ya, unu ekwela ka onye ọbụla kpee unu ikpe banyere ihe ọbụla unu na-eri, maọbụ ihe unu na-aṅụ, maọbụ ihe banyere ido ụbọchị nsọ, maọbụ ime mmemme ọnwa ọhụrụ maọbụ mmemme ụbọchị izuike.

17Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst.

18Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.