Ndị Kọlọsị 2

Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ.

Colossians 2:22 (UKJV) Which all are to perish with the using;) after the commandments and doctrines of men?

20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?

21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”?

22Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ.

23Nʼezie, iwu ndị a yiri ihe e ji amamihe guzobe, nʼihi ụzọ o si akwali mmụọ mmadụ nʼife ofufe dị ka ọ chọrọ, na iweda onwe nʼala, na ịta anụ ahụ ahụhụ. Ma ha abaghị uru o bụla iji ha gbochie agụụ ọjọọ nke anụ ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.