Ndị Kọlọsị 3

Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.

Colossians 3:14 (UKJV) And above all these things put on love, which is the bond of perfection.

12Ya mere, dị ka ndị Chineke họpụtara, ndị dị nsọ na ndị ọ hụrụ nʼanya, yikwasịnụ onwe unu obi ọmịiko, na obi ebere, na obi dị umeala, na ịdị nwayọọ, na ntachiobi.

13Na-anagidenụ ibe unu, gbagharakwa mmejọ ọbụla ibe unu na-emejọ unu. Gbagharanụ dị ka Onyenwe anyị sị gbaghara unu.

14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.

15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.

16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.