14Nke kachasị nke, kwerenụ ka ịhụnanya na-achị achị na ndụ unu, nʼihi na ọ bụ nke a na-ejikọta ihe niile nʼotu.
15Ka udo Kraịst na-achị achị nʼime obi unu, ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, a kpọrọ unu ka unu nọdụ nʼudo. Mgbe niile, nọọnụ na-ekele.
16Ka okwu nke Kraịst biri nʼime unu nʼuju ya. Werenụ amamihe niile na-akụzirịta ibe unu ihe, ma na-adụrịtakwa ibe unu ọdụ. Werekwanụ abụ ọma na abụ nke ime mmụọ bụọrọ Chineke abụ ekele nʼobi unu.
17Ka ihe niile unu na-eme, nʼokwu maọbụ nʼomume bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs, na-enyekwanụ Chineke Nna ekele site na ya.
18Ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu, dị ka ọ kwesiri ime nʼime Onyenwe anyị.