19Unu ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya, unu ejikwala obi ilu na-emeso ha omume.
20Ụmụntakịrị, ruberenụ nne na nna unu isi nʼihe niile, nʼihi na nke a na-amasị Onyenwe anyị.
21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.
22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.
23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.