Ndị Kọlọsị 3

Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.

Colossians 3:23 (UKJV) And whatsoever all of you do, do it heartily, as to the Lord, and not unto men;

21Unu bụ nna, unu emela ihe ga-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha ghara ịda mba nʼobi.

22Ndị bụ ohu, na-eruberenụ ndị bụ nna unu ukwu nʼanụ ahụ isi nʼihe niile, na-emenụ nke a, ọ bụghị naanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, maọbụ mgbe unu chọrọ ịnata ihuọma, kama werenụ obi unu niile, na ịtụ egwu Onyenwe anyị rubere ha isi.

23Ihe ọbụla unu na-eme, werenụ obi unu niile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.

24Chetanụ nke ọma na unu nwere ụgwọ ọrụ nke Onyenwe anyị kwadobere inye unu, ndị ya. Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị Kraịst ka unu na-ejere ozi.

25Onye ọbụla na-eme ihe ọjọọ ga-anata ụgwọ ọrụ nʼihi ihe ọjọọ niile o mere. Nʼihi na ile mmadụ anya nʼihu adịghị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.