17Chineke mere ka ụmụ okorobịa anọ ndị a nwee ọgụgụisi pụrụ iche na nghọta nʼihe ọbụla gbasara edemede na amamihe niile. Daniel nwekwara nghọta ịkọwa ụdị ọhụ niile na nrọ niile.
18Mgbe oge eze nyere a ga-eji kpọbata ha nʼije ozi ya zuru, onyeisi ndị na-eje ozi chere ha nʼihu Nebukadneza.
19Ha na eze kparịtakwara ụka. Ma nʼime ụmụ okorobịa ahụ niile a zụrụ, o nweghị nke amamihe ya juru eze afọ dịka amamihe Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya. Nʼihi nke a, o mere ka ha soro bụrụ ndị na-adụ ya ọdụ.
20Mgbe ọ bụlakwa eze chọrọ ndụmọdụ banyere amamihe na nghọta, ọ na-achọpụta na ndụmọdụ ha na-enye ya na-adị mma okpukpu iri karịa ndụmọdụ nke ndị majiki ya na ndị maara ihe banyere kpakpando nọ nʼalaeze ya na-enye ya.
21Daniel nọgidere bụrụ onye na-adụ eze ọdụ tutu ruo afọ mbụ nke Sairọs bidoro ịchị dịka eze.