1Mgbe afọ atọ gafere site na mgbe Jehoiakim bidoro bụrụ eze na-achị Juda, Nebukadneza eze na-achị Babilọn bịara buso Jerusalem agha.
2Onyenwe anyị nyefere Jehoiakim, eze Juda nʼaka ya, na ihe ụfọdụ e jiri chọọ ụlọnsọ Chineke mma. O buuru ha niile gawa Shaịna nʼụlọ chi ya, dobe ha nʼime nʼụlọakụ chi ya.
3Eze nyere Ashipenaz, onyeisi ndị ozi ya iwu ka ọ kpọbata ụmụ okorobịa sitere nʼezinaụlọ eze na nke ndị ọchịchị nʼala Izrel nʼije ozi eze.
4Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.