6Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
7Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
8Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.
9Ma Chineke mere ka Daniel nweta ihuọma na obi ebere nʼaka onyeisi ndị na-ejere eze ozi. O nwekwara ọmịiko nʼebe Daniel nọ nʼihi ọnọdụ ha.
10Ma onyeozi a gwara Daniel, “Ana m atụ egwu nʼihi onyenwe m eze, onye kwuru ihe unu ga-eri na ihe unu ga-aṅụ. Ọ bụrụ na ọ hụ na unu tara ahụ karịa ndị ọgbọ unu ndị ọzọ, ndụ m ga-anọ na nsogbu nʼaka onye eze.”