4Ụmụ okorobịa ndị a ga-abụ ndị nʼenweghị nkwarụ ọbụla nʼahụ ha, ndị mara mma ile anya na ndị nwere nghọta banyere ihe ọmụma dị iche iche. Ha kwesikwara ịbụ ndị maara ihe, ndị na-amụta ihe ọsịịsọ na ndị tozuru oke ije ozi nʼụlọeze. Ọ ga-akụziri ha asụsụ na akwụkwọ ọgụgụ dị iche iche nke ndị Kaldịa.
5Onye eze si nʼoche nri ya na-ewepụta nri na mmanya a ga-enye ha kwa ụbọchị. Ha ga-anọ nʼọzụzụ a afọ atọ, nke ọ ga-abụ e mechaa, ha ga-abụ ndị kwesiri ịnọ nʼije ozi nʼobi onye eze.
6Ndị so nʼime ha bụ Daniel, na Hananaya, na Mishael, na Azaraya, ha bụ ndị Juda.
7Ma onyeisi ndị na-ejere eze ozi nyere ha aha ọhụrụ ọzọ Daniel ka ọ kpọrọ Belteshaza; Hananaya ka ọ kpọrọ Shedrak; ọ kpọrọ Mishael, Mishak; kpọkwa Azaraya, Abednego.
8Ma Daniel kpebiri nʼobi ya na ọ gaghị emerụ onwe ya site nʼiri nri maọbụ ịṅụ mmanya eze. Ya mere ọ rịọrọ onyeisi ndị ozi ka ọ hapụ ya ka ọ ghara imerụ onwe ya.