Daniel 10

Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”

Daniel 10:19 (UKJV) And said, O man greatly beloved, fear not: peace be unto you, be strong, yea, be strong. And when he had spoken unto me, I was strengthened, and said, Let my lord speak; for you have strengthened me.

17Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”

18Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike.

19Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”

20Mgbe ahụ, ọ sịrị, “Ị maara ihe mere m ji bịakwute gị? Aga m alaghachi azụ ịlụso onyeisi na-achị alaeze Peshịa ọgụ, mgbe mụ ga-apụ, eze na-achị Griis ga-abịa;

21ma otu ọ dị, aga m agwa gị ihe e dere nʼakwụkwọ nke eziokwu. (Ọ dịghị onye na-enyere m aka imegide ha ma ọ bụghị naanị Maikel onyeisi unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.