15Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.
16Mgbe ahụ, otu onye, nke yiri mmadụ, bịara metụ egbugbere ọnụ m aka, mee ka m nwee ike ikwukwa okwu ọzọ. Mgbe ahụ agwara m onye ahụ nke guzo m nʼihu, “Anọ m nʼoke ihe mgbu; Onyenwe m, enwekwaghị m ike ọbụla, nʼihi ọhụ m hụrụ.
17Olee otu mụ bụ ohu gị ga-esi gwa gị okwu, Onyenwe m? Nʼihi na ike adịghịkwa nʼime m, enwekwaghị m ike iku ume.”
18Mgbe ahụ, otu onye yiri mmadụ bịara metụkwa m aka ọzọ nye m ike.
19Ọ sịrị, “Onye a hụrụ nʼanya nke ukwu, atụkwala ụjọ, udo dịrị gị, ya mere dịrị ike, obi sie gị ike.” Mgbe ọ gwara m okwu a, ike m lọghachitere, asịrị m, “Ka onyenwe m kwuo okwu, ebe i nyeghachila m ike.”