1Nʼafọ atọ nke ọchịchị Sairọs eze Peshịa, e nyere Daniel (onye aha ya bụkwa Belteshaza mkpughe). Ozi ahụ bụ eziokwu, ọ gbasakwara oke ọgbaaghara. Ọ ghọtara ozi ahụ, nwetakwa nkọwa banyere ọhụ ahụ.
2Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.
3Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.
4Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,