Daniel 10

Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,

Daniel 10:4 (UKJV) And in the four and twentieth day of the first month, as I was by the side of the great river, which is Hiddekel;

2Nʼoge ahụ, mụ onwe m, bụ Daniel, ruru ụjụ izu ụka atọ.

3Erighị m nri ọma ọbụla, erikwaghị m anụ, aṅụkwaghị m mmanya, eteghị m mmanụ otite ọbụla nʼahụ m nʼime izu ụka atọ a niile.

4Nʼụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ, eguzo m nʼakụkụ osimiri ukwu ahụ, bụ Taịgris,

5eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.

6Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.