Daniel 10

Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.

Daniel 10:9 (UKJV) Yet heard I the voice of his words: and when I heard the voice of his words, then was I in a deep sleep on my face, and my face toward the ground.

7Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.

8Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.

9Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.

10Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ.

11Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.