Daniel 10

Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.

Daniel 10:8 (UKJV) Therefore I was left alone, and saw this great vision, and there remained no strength in me: for my loveliness was turned in me into corruption, and I retained no strength.

6Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.

7Ọ bụ naanị m Daniel hụrụ ọhụ a. Ndị mụ na ha nọ ahụghị ya, kama na mberede, e mere ka oke egwu tụọ ha, nke mere ka ha gbara ọsọ gaa zoo onwe ha.

8Ọ bụkwa naanị m nọ, mgbe m hụrụ oke ọhụ a. Mgbe m hụkwara ya, ike niile dị m nʼahụ si m nʼahụ pụọ. Ihu m gbanwere nke ukwuu, ike afọdụkwaghị m nʼahụ.

9Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra.

10Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.