Daniel 11

Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.

Daniel 11:18 (UKJV) After this shall he turn his face unto the isles, and shall take many: but a prince for his own behalf shall cause the reproach offered by him to cease; without his own reproach he shall cause it to turn upon him.

16Ma onye nke na-ebuso ya agha ga-eme ihe masịrị ya, ma o nweghị onye ga-egbochi ha. Ọ ga-abatakwa nʼAla Ọma ahụ, ebe ihe niile ga-anọ nʼokpuru ya.

17Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.

18Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.

19Ọ ga-echigharị azụ chee ihu ya ebe niile e wusiri ike nke ala nke ya, ọ ga-asọ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya ọzọ.

20“Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.