Daniel 11

“Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.

Daniel 11:20 (UKJV) Then shall stand up in his estate a raiser of taxes in the glory of the kingdom: but within few days he shall be destroyed, neither in anger, nor in battle.

18Mgbe ọ mesịrị nke a, ọ ga-eche ihu ya nʼobodo ndị ahụ niile dị nʼọnụ osimiri. Ọ ga-emerikwa ọtụtụ nʼime ha. Ma otu ọchịagha ga-alụso ya ọgụ, mee ka o jiri ọsọ gbaghachi nʼihere.

19Ọ ga-echigharị azụ chee ihu ya ebe niile e wusiri ike nke ala nke ya, ọ ga-asọ ngọngọ daa, a gaghị ahụkwa ya ọzọ.

20“Otu onye ga-abịa nọchie ọnọdụ ya, ọ ga-ezipụ onye ga-ekegbu ndị mmadụ nʼụtụ iji mee ka otuto nke alaeze ahụ daa, ma nʼime ụbọchị ole na ole, a ga-egbu ya, ma ọ gaghị abụ nʼagha maọbụ nʼihu mmadụ.

21“Nʼọnọdụ ya, otu onye ọjọọ e ledara anya ga-ebilite, onye na-ekwesighị iwere nsọpụrụ nke ya bụ ọchịchị. Ọ ga-abata nʼike nʼalaeze ahụ mgbe ndị ya nọ nʼudo, ọ ga-eji nwayọọ ma were ire ụtọ na aghụghọ nweta alaeze ahụ.

22Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.