1Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Daraiọs onye Midia, ọ bụ m guzoro inyere ya aka na ichekwa ya.)
2“Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis.
3Ma mgbe ahụ, a ga-enwe eze dị ike nke ga-eji oke ike chịa. Ọ ga na-eme ihe masịrị ya.
4Ma mgbe ọ rịgotachara nʼọchịchị, a ga-ekposa alaeze ya kesaa ya nʼakụkụ anọ nke ụwa ma ọ bụghị ụmụ ya ga na-achị. Ọ bụghịkwa nʼusoro dịka ike ọchịchị ya si dị, nʼihi na a ga-ehopu alaeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ọzọ na-abụghị ndị agbụrụ ya.