2“Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis.
3Ma mgbe ahụ, a ga-enwe eze dị ike nke ga-eji oke ike chịa. Ọ ga na-eme ihe masịrị ya.
4Ma mgbe ọ rịgotachara nʼọchịchị, a ga-ekposa alaeze ya kesaa ya nʼakụkụ anọ nke ụwa ma ọ bụghị ụmụ ya ga na-achị. Ọ bụghịkwa nʼusoro dịka ike ọchịchị ya si dị, nʼihi na a ga-ehopu alaeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ọzọ na-abụghị ndị agbụrụ ya.
5“Eze nke ndịda ga-adị ike, ma otu onye nʼime ndịisi agha ya ga-adị ike karịa ya, chịakwa alaeze dị ukwu karịa nke ya
6Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.