22Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ.
23Mgbe ọ banyesịrị nʼọgbụgba ndụ, ọ ga-eji aghụghọ na-eme mpu, ọ ga na-esiwanye ike nʼagbanyeghị nʼọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ole na ole.
24Ọ ga-abanye nʼakụkụ ala ahụ niile a maara ndị bara ụba bi, mee nʼebe ahụ ihe ndị buru ya ụzọ na-emebeghị. Ọ ga-ekesara ndị mmadụ akụnụba na ihe nkwata ndị ọzọ ọ lụtara nʼagha. Ọ ga-atụpụta aro iji lụso obodo siri ike ọgụ, ma nke ahụ ga-adị nwa mgbe nta.
25“Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya.
26Nʼihi na ndị na-eri ihe ọma eze ga-etipịa ya. A ga-achụsa ndị agha ya, ma gbukwaa ọtụtụ nʼọgbọ agha.