Daniel 11

“Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya.

Daniel 11:25 (UKJV) And he shall stir up his power and his courage against the king of the south with a great army; and the king of the south shall be stirred up to battle with a very great and mighty army; but he shall not stand: for they shall forecast devices against him.

23Mgbe ọ banyesịrị nʼọgbụgba ndụ, ọ ga-eji aghụghọ na-eme mpu, ọ ga na-esiwanye ike nʼagbanyeghị nʼọnụọgụgụ ndị mmadụ dị ole na ole.

24Ọ ga-abanye nʼakụkụ ala ahụ niile a maara ndị bara ụba bi, mee nʼebe ahụ ihe ndị buru ya ụzọ na-emebeghị. Ọ ga-ekesara ndị mmadụ akụnụba na ihe nkwata ndị ọzọ ọ lụtara nʼagha. Ọ ga-atụpụta aro iji lụso obodo siri ike ọgụ, ma nke ahụ ga-adị nwa mgbe nta.

25“Mgbe ahụ, ọ ga-emesi onwe ya obi ike, chịkọtaa ọtụtụ ndị agha ibuso eze ndịda agha. Eze ndịda ga-achịkọtakwa ndị agha dị ọtụtụ dịkwa ike lụso ya ọgọ ma ọ gaghị enwe ike guzogide ya nʼihi izuzu nzuzo a gbara megide ya.

26Nʼihi na ndị na-eri ihe ọma eze ga-etipịa ya. A ga-achụsa ndị agha ya, ma gbukwaa ọtụtụ nʼọgbọ agha.

27Ndị eze abụọ a, ndị obi ha jupụtara nʼihe ọjọọ ga-anọkọta nʼotu tebul na-agwarịta ibe ha okwu ụgha, ma nzukọ ha agaghị enwe isi, nʼihi ọgwụgwụ ahụ ga-adị mgbe a kara aka ruru.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.