Daniel 11

Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya.

Daniel 11:42 (UKJV) He shall stretch forth his hand also upon the countries: and the land of Egypt shall not escape.

40“Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe.

41Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya.

42Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya.

43Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya.

44Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.