41Ọ ga-abata na Ala Ọma ahụ, gbukwaa iri puku mmadụ kwuru iri puku mmadụ, ma obodo Edọm, obodo Moab na ndị ndu nke Amọn ga-agbapụ site nʼike ya.
42Ọ ga-aga ibuso ọtụtụ obodo agha, Ijipt agaghị agbanarị ya.
43Ọ ga-enwe ikike nʼebe akụ nke ọlaọcha na ọlaedo na ụba niile nke ala Ijipt. Ndị Libịa na ndị Kush ga-edokwa onwe ha nʼokpuru ya.
44Ma nʼoge a kwa, ozi ga-esi nʼọwụwa anyanwụ na nʼugwu bịa, nke ga-emenye ya egwu. Nʼihi ya, ọ ga-eji oke iwe pụọ ibibi ọtụtụ ndị ma laakwa ha nʼiyi.
45Ọ ga-akwụba ụlọeze ya nʼetiti ugwu ọma ahụ dị nsọ na nʼoke osimiri, nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, ọ ga-abịaru ọgwụgwụ ya, ọ dịghịkwa onye ga-enyere ya aka.